Psalms 101

Abụ Ọma Devid.

Nkwa eze

1Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;
o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.
2Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,
olee mgbe ị ga-abịakwute m?

Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla
jegharịa nʼime ụlọ m.
3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya
nʼihu m.

Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.
Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.
4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.
Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,
onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;
agaghị m anabata
onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.

6Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,
ka mụ na ha biri;
onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla
ga-ejere m ozi.

7Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ
agaghị ebi nʼụlọ m;
onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha
agaghị eguzokwa nʼihu m.

8Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu
bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a;
Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe
site nʼobodo Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU